NTULERIKOTA OLUNDI ACHI NA IGBO IZUGBE

NTULERIKOTA OLUNDI ACHI NA IGBO IZUGBE

  • The Complete Research Material is averagely 52 pages long and it is in Ms Word Format, it has 1-5 Chapters.
  • Major Attributes are Abstract, All Chapters, Figures, Appendix, References.
  • Study Level: MTech, MSc or PhD.
  • Full Access Fee: ₦8,000

Get the complete project » Instant Download Active

ISI NKE MBU

1.0  OKWU MMALITE

N’elu uwa dum mmadu bi, obodo obula nwere olundi e ji mara ya. O bu nihi nke a ka eji esite n’asusu mmadu mara obodo onye ahu si. Asusu bu ihe mmadu ji akowaputa echiche ya, o bukwa asusu ka mmadu na ibe ya ji enwe mmekorita nke ikwurita okwu. Anumanu enweghi asusu, o bu naani mmadu bu anu nwere asusu puru iche o ji enwe mmekorita n’etiti ya na ibe ya.

Crystal (1971) kowara asusu dika udaolu mmadu a haziri ahazi n’udi nke na-abughi ebumputa uwa mmadu n’onwe ya mebere e ji akowaputa echiche site n’okwu onu ma obu ederede. Nkowa nke a gosiputara na o bu mkpa mmadu nwere ime ka a mara ihe o bu n’obi kpalitere asusu. Nchoputa a choputara gosiri na e nwere ihe kariri nari asusu abuo na iri ise n’ime obodo anyi bu Naijiria. Asusu ndi putakariri ihe bu Igbo, Hausa na Yoruba. Asusu na-enwe olumba na olu onye nke a bu out njirimara asusu. Asusu Igbo nwere otutu


10


olumba mejuputara ya nke ndi okammuta ufodu dika Ikekonwu (1985) kwuru na ekeree ya uzo isii, ka e si asu ya na obodo ebe na-asu ya gunyere;

1.           Igbo ndi owuwa anyanwu Naija

2.           Igbo ndi odida anyanwu Naija

3.           Olundi mgbago ugwu

4.           Igbo Nnon’etiti

5.           Igbo Cross River

6.           Olundi Ohaji/Eghema

Igbo Izugbe, dika e si ahuta ya; Anozie (1999) kwuru na e nwere ike iwere otu asusu kwuuru onwe ya maobu otu n’ime olumba mebere asusu obula jiri ya mebe Igbo Izugbe. Ihe di mkpa bu ileba anya were asusu maobu olundi nke mmadu niile nwere nmasi nay a jiri ya mere asusu izugbe. Nkowa nke a gosiri na o bu site n’olundi di iche iche ka e si achikoba ya. Nke a gosiri n o bu ihe di ezigbo mkpa ileba anya n’olu ndi iche iche iche mebere asusu Igbo ka wee site na ha mee ka asusu Igbo na-eto eto etu okwesiri. O bu nkw a so n’ihe


11


kpaliri mmuo nwanchocha ime nchocha banyere olundi obodo ya bu Achi site n’itulerikota ya na Igbo Izugbe.

1.1  MGBAKWASA ISIOKWU

Asusu Igbo bu otu n’ime asusu ato kacha puta ihe na Naijiria ma burukwa otu n’ime asusu e ji eme nchocha n’ogo di elu. Nihi ya ka o ji di ezigbo mkpa ileba anya n’isi okwu nchocha a bu Nkulerikota olundi Achi na Igbo Izugbe.

Otutu mgbanwe adila n’ebe asusu Igbo di nihi obibia nke uka na agumakwukwo nke ndi ocha biara n’ala Igbo wetara. O bu ihe doro anya na asusu bu otu n’ime omenala e ji amata agburu obula, mana a bia n’obodo anyi bu Naijiria taa, a ga-achoputa na oke agumakwukwo na mmepe di iche iche e meela ka agburu ufodu tumadu agburu Igbo na-eleda asusu ha anya ma nwee oke mmasi n’iwelite asusu agburu ndi ozo okasi asusu Bekee. O bughi naani na Igbo Izugbe na-alaghachi azu, kama nke jogburu onwe ya bu na mperimpe asusu di iche iche olundi mejuputara Igbo Izugbe na-anwuzi anwu. Ekele diri otu iwelite asusu na omenala ndi Igbo


12


(SPILC) bu otu gbadosiri ukwu ike n’ala si na asusu Igbo agaghi ada n’ala ma obu nwuo anwu.

Emenchocha a gbodoro ukwu na mkpu ndi huru asusu Igbo n’anya, na’eti wee leba anya n’olu ndi Achi ka otu n’ime olundi di iche iche mejuputara Igbo izugbe iji chetara umu Igbo na o ga-abu nnukwu ihe nwute ma a hapu asusu Igbo ka nwuo pii. Olundi obula bu onyinye puru iche Chineke nyere ha iji nwee mmekorita n’etiti ha na ibe ha, o buy a mere nwanchocha jiri huta ya dika ihe bara uru ma dikwa oke mkpa ileba any n’olundi obodo ya.

1.2  NSOGBU NCHOCHA

O nwere nsogbu di iche iche a choputara n’emenchocha a. nwanchocha choputara na otutu ndi Achi anaghizi enwe mmasi n’isu asusu Achi. Otutu n’ime ha amaghi ka e si asu asusu ahu ma ncha, nihi oke apumije na mmepe. Nke a mere ka asusu Achi na-alaghachi azu.

Nsogbu ozo bun a mgbanwe di iche iche na-abata n’agumakwukwo nke mere na a na-ele onye a maghi asu asusu


13


Bekee dika onye amaghi akwukwo, nke a mere ka nne na nna bu ndi kwesiri iji olundi zulite umu ha na-agba nnukwu mbo iji asusu Bekee wee tooro umu ha nto ala asusu ngwa ngwa ha malitere ikwu okwu. Onodu a nyere nsogbu nke ukwu maka na o na-eme ka asusu Achi di ka asusu na-abaghi I’ihe.

Nsogbu ozo enwere bu n’ichota ndi okenye maara maka asusu Achi nkeoma. Otutu n’ime ndi okenye anwuola, ndi foduru afodu, nghota anaghi adizi n’okwu ha nihi na ha akaala nka nka ukwu. Ozo bun a ngwakorita olu ndi Achi na olundi ndi ozo ha na ha gbara agbata obi, nke a mere ka ndi nke kana asu asusu Achi ghara idi na-asu asusu ahu kpomkwem.

Nke ozo bun a e nweghi akwukwo e dere banyere olundi di iche iche e nwere n’asusu Igbo tinyekwara na asusu bu ihe omimi ma sikwaa ike na ntule nke mere na e mebeghi otutu nchocha banyere olumba Achi.

Nsogbu ozo bun a ihere na-eme umu akwukwo obuladi ndi nkuzi bu ndi Achi iziputa ihe ha bu n’obi mgbe ha na-aza ajuju a juru


14


ha. Ufodu ndi a gbara ajuju onu eweputachaghi ihe a turu anya n’ihi na ihere isuputa olundi Achi na-eme ha.

1.3  EBUMNUCHE NCHOCHA

O na-enwe ihe mmadu bu n’uche mgbe obula o na-amalite ime ihe; nihi ya nwanchocha nwere ihe kpaliri mmuo ya ime nchocha n’isiokwu a bu Ntulerikota olundi Achi na Igbo Izugbe. Nwanchocha choputara na e mebeghi nchocha n’olundi Achi n’uzo putara ihe nke oma. O bu ya mere na ihe mbu bu ebumnobi nchocha a bu ileba anya n’olundi Achi. Ebumnobi na-aga esite n’udi nchocha a wee mee ka nwa afo Igbo obula, tumadu ndi Achi mara na olundi ha bu onyinye amara Chukwu nyere ha nke kwesiri ka ha jidesie ike.

Ebumnobi ozo e jiri mee nchocha a bu ka e site nay a nye aka iwelite asusu na omenala Igbo maka na o bu ihe ifufe isi na ndi Igbo na-ahapuzi ihe a kuru na-agba ihe ozo n’ihe gbasara isu asusu ha. O bughi naani na nwanchocha choro isite na nchocha nke a mee ka a mata ileda asusu Igbo anya ma sitekwa n’uzo di otu a welite asusu Igbo site n’ituputa ihe ndi di mkpa n’olundi Achi ga-enyere Igbo


15


izugbe aka iji na-eto eto.

1.4  URU NCHOCHA

A bara n’ime nchocha a nke isiokwu ya bu Ntulerikota olundi Achi na Igbo Izugbe. Nihi olile anya e nwere na o ga-abara ohanaeze uru. Ufodu n’ime uru ndia bu na –

1.           O ga-enyere umuakwukwo na-amu maka asusu aka ighota ihe bu olundi na Igbo izugbe na imata myiri na ndiche din a ha.

2.           Ndi nkuzi ga-eritekwa uru na nchocha a nihi na o ga-eme ka mmuta ha nwere bawanye uba n’ebe olundi na Igbo izugbe di.

3.           Ihe mmuta sitere na nchocha a ga-emekwa ka oha na eze tumadu ndi Achi ghota na asusu ha bara uru ma burukwa nke na-ekwesighi ka o na-eme ha ihere.

4.           Nchocha a bara uru nye ndi ozo ga-eme nchocha n’udi isiokwu a n’odinihu.

5.           Nchocha a ga-eme ndi mmadu ghota na asusu bu ihe di mkpa ma burukwa ihe kwesiri ka e chekwaa ka ogbo ndi na-eso na’azu wee nwee mmasi ijidesi ya ike.


16


1.5  OKERE NCHOCHA

O bu eziokwu na olundi Igbo abughi otu ma o bu otu ihe ka ha na

ekwu.  N’edemede nchocha a, a ga-eleba anya n’ihe banyere olundi

Achi na ntulerikota ya na Igbo izugbe.  Ihe ozo a ga-eleba anya bu

bu  usoro  odidiudasusu  mkpurudasusu,  usoromkpoputa  na-abata

n’olundi Achi nke puru iche n’igbo izugbe.

AJUJU NCHOCHA

1.           E nwere mmetuta n’etiti olundi Achi na nke Igbo Izugbe?

2.           E nwere myiri ma obu ndiche n’etiti mkpurudasusu Achi na nke Igbo Izugbe?

3.           Olee ihe mere mkpoputa mkpurudaasusu ndi Achi ufodu na nke Igbo Izugbe jiri di iche?

4.           Olee ebe usorodidiudaasusu Achi na nke Igbo Izugbe yiri na ebe ha di iche?

5.           Gini mere asusu ndi Achi ji enye otutu ndi ntorobia nsogbu osusu?


You either get what you want or your money back. T&C Apply







You can find more project topics easily, just search

Quick Project Topic Search